Romans 15:31 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Biko, rịọnụ Chineke ka ọ zọpụta m nꞌaka ndị na-amaghị ya nọ na Jerusalem. Kpeekwanụ ekpere ka Chineke mee ka ndị Kraịst ahụ anyị na-ewegara onyinye a jiri obi ọma nata ya.
Igbo 2006
Ka ewe dọputam n'aka ndi nēkweyeghi ekwenye ndi nọ na Judia, ka ije-ozim nke m'ji je Jerusalem we búru kwa ihe ndi nsọ gānara nke-ọma;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ka a dọpụta m nʼaka ndị na-ekweghị ekwe nọ na Judịa. Ka ọrụ m maka Jerusalem bụrụ ihe ndị nsọ nọ ebe ahụ ga-anabata.