Romans 15:4 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ihe ndị a nile e dere nꞌakwụkwọ nsọ nꞌoge gara aga bụ maka izi anyị ntachi obi, na ịgba anyị ume. Ka anyị site na ha na-ele anya ọbịbịa nke ụbọchị ahụ Chineke ga-ala ike mmehie na ọnwụ nꞌiyi.
Igbo 2006
N'ihi na ka ha ra, bú ihe edere n'akwukwọ nsọ n'oge gara aga, edere ha izí ayi ihe, ka ayi we were ntachi-obi na nkasi-obi nke ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ nwe olile-anya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na ihe niile edere nʼoge gara aga bụ iji kuziere anyị ihe, ka anyị nwee ike isite na ntachiobi nakwa nkasiobi, nke dị nʼakwụkwọ nsọ nwee olileanya.