Romans 15:8 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Chetakwanụ na Kraịst bịara igosi anyị na Chineke bụ onye na-emezu nkwa o kwere. Chetakwa na ọ bịakwara inyere ndị Juu aka.
Igbo 2006
N'ihi na asim na emewo Kraist ka Ọ buru onye nējere obibì-úgwù ozi n'ihi ezi-okwu Chineke, ka O we me ka nkwa nile ekwere nna-ayi-hà guzosie ike,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ana m agwa unu na Kraịst aghọọla onye na-ejere ndị e biri ugwu ozi nʼihi eziokwu nke Chineke, iji mee ka nkwa e kwere ndị bụ nna nna anyị ochie guzozie.