Romans 15:9 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Chetakwa na ọ bịara ime ka ndị mba ọzọ bụrụ ndị Chineke ga-anabata, ndị ga-eto Chineke nꞌihi obi ebere ya o gosiri ha. Nke a bụ ihe onye dere akwụkwọ Abụ Ọma bu nꞌobi mgbe o dere sị, “Aga m eto aha gị nꞌetiti ndị mba ọzọ. Aga m abụ abụ otuto nye aha gị.”
Igbo 2006
ka ndi mba ọzọ we nye kwa Chineke otuto n'ihi ebere-Ya; dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, N'ihi nka ka M'gēkwuputa Gi n'etiti mba nile, Aha-Gi ka m'gābùku kwa abù ọma.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ka ndị mba ọzọ nwe ike inye Chineke otuto maka ebere ya, dịka e dere ya, “Nʼihi nke a, aga m eto gị nʼetiti ndị mba ọzọ, aga m abụ abụ nye aha gị.”