Romans 16:23 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Gayọs, onye m nọ nꞌụlọ ya, na onye na-elekọta m, na-ekele unu. Otu a kwa, ndị nile naezukọ nꞌụlọ ya na-ekelekwa unu. Irastọs, onye na-eche ego ndị obodo a na nwanna anyị nwoke, na-ekelekwa unu.
Igbo 2006
Gaiọs, onye nēlem na nzukọ Kraist dum ọbìa, nēkele unu. Erastọs onye nāchi ihe obodo nēkele unu, na Kwọtọs nwa-nna-ayi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Gaiọs, onye na-ele mụ na nzukọ niile ọbịa nʼebe a, na-ekelekwa unu. Otu a kwa, ndị niile na-ezukọ nʼụlọ ya na-ekelekwa unu. Erastọs, onye na-elekọta ihe ndị obodo a na nwanna anyị nwoke Kwatọs, na-ekelekwa unu.