Romans 2:1 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Enyi m nwoke, ọ bụrụ na ị na-edo onwe gị ugbu a dị ka onye ikpe megide ndị ahụ mehiere, achọrọ m ime ka ị mata na o nweghị ụzọ o si kwesị ekwesị ka gị, onye ọ bụla ị bụ, kpee onye ọzọ ikpe. Nꞌihi na mgbe ị mara onye ọzọ ikpe, chetakwa na ọ bụkwa onwe gị ka ị na-ama ikpe, ebe ọ bụ na gị onwe gị na-emekwa otu ụdị mmehie ahụ.
Igbo 2006
N'ihi ya i nweghi ngọpu, gi madu, onye ọ bula nēkpe ikpé: n'ihi na i nāma onwe-gi ikpe n'ihe i nēkpe madu-ibe-gi; n'ihi na gi onye nēkpe ikpe nēme otù ihe ahu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi ya, ị nweghị ngọpụ, onye ọbụla ị bụ, mgbe ị na-ekpe ndị ọzọ ikpe. Nʼihi na mgbe ị mara onye ọzọ ikpe, ọ bụ onwe gị ka ị na-ama ikpe maka na gị onwe gị na-emekwa ụdị ihe ndị ahụ.