Romans 2:12 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌdị nile mehiere nꞌọnọdụ enweghị iwu ga-ala nꞌiyi na-agbanyeghị ihe iwu kwuru. Ma ndị nile mehiere megide iwu ahụ ha maara ihe banyere ya ka a ma-ama ikpe dị ka iwu si kwuo.
Igbo 2006
N'ihi na ka ha ra, bú ndi mehiere nēnweghi iwu, ha gāla kwa n'iyì nēnweghi iwu: ka ha ra kwa, bú ndi mehiere n'okpuru iwu, agēsite n'iwu kpe ha ikpé;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị niile mehiere nʼọnọdụ enweghị iwu ga-ala nʼiyi nʼọnọdụ enweghị iwu. Ma ndị niile mehiere megide iwu ahụ ha mara ihe banyere ya ka a ga-ama ikpe dịka iwu siri kwuo.