Romans 2:15 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌihi na ndụ ha na-egosipụta na e deela ihe ndị ahụ iwu kwuru nꞌobi ha. Akọnuche ha na-egosikwa na nke a bụ eziokwu, ebe ọ bụ na akọnuche ha na-ama ha ikpe mgbe ufọdụ, ma na-etokwa ya mgbe ụfọdụ.
Igbo 2006
n'ihi na ha nēgosi ọlu iwu na edewo ya n'obi-ha, akọ-na-uche-ha nēso kwa ya nāb͕a àmà, ihe ha nātule n'obi-ha n'etiti onwe-ha nēbo kwa ha ebubo ma-ọbu ma eleghi anya nāgọpu ha;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha na-egosipụta na edeela ihe ndị ahụ iwu kwuru nʼobi ha. Akọnuche ha na-egosikwa na nke a bụ eziokwu, ebe ọ bụ na akọnuche ha na-ama ha ikpe mgbe ụfọdụ, ma na-agọpụrụ ha mgbe ụfọdụ.