Romans 2:21 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma ugbu a, enyi m nwoke, mgbe a nile ị na-ezi ndị mmadụ ihe ị na-ezikwa onwe gị? Ị na-ezi ndị ọzọ na izu ohi bụ ihe ọjọọ, i leziela anya hụ na ị naghị ezu ohi?
Igbo 2006
ya mere gi onye nēzí madu-ibe-gi ihe, ì dighi-ezí onwe-gi? gi onye nēkwusa ka madu ghara izu ori, ì nēzu ori?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Gị onye na-akụziri mmadụ ibe gị ihe, ị na-akụzikwara onwe gị? Gị onye na-ekwusa ka mmadụ ezula ohi, ị na-ezu ohi?