Romans 2:22 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ị na-agwa ndị mmadụ ka ha ghara ịkwa iko, i leziela anya hụ na gị onwe gị adịghị akwa iko? Ị chọghị iji anya hụ ka mmadụ na-ekpere arụsị a kpụrụ akpụ, ma ọ naghị ezukpọ ego dị nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke?
Igbo 2006
gi onye nāsi ka madu ghara ikwa iko, ì nākwa iko? gi onye nākpọ arusi ihe-árú, ì nēzu ihe ulo chi ori?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Gị onye na-asị mmadụ akwala iko, ị na-akwa iko? Gị onye na-akpọ arụsị ihe arụ, ị na-ezuru ihe dị nʼụlọ arụsị nʼohi?