Romans 3:13 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Okwu na-esi ha nꞌọnụ apụta bụ okwu rere ure, nke na-esi isi dị ka isi na-esite nꞌili ghe oghe na-apụta. Ire ha jupụtakwara nꞌokwu ụgha. Okwu ọjọọ ha na-ekwu nwere ike igbu mmadụ. Ọ dị ka elo si nꞌọnụ ajụala apụta.
Igbo 2006
Ílì ghere oghe ka akpiri-ha bu; Ha jiri ire-ha ghọ aghughọ: Edide aju-ala di n'okpuru eb͕ub͕ere-ọnu-ha:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Akpịrị ha bụ ili ghere oghe, ha ji ire ha na-aghọ aghụghọ. Elo ajụala dị nʼegbugbere ọnụ ha.