Romans 3:19 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Anyị maara na idebe iwu dịịrị ndị ahụ Chineke nyere iwu ya. Ma e mekwara ka iwu bụrụ ihe ga-eme ka ọnụ ndị mmadụ nile dere duu, ka mmadụ nile nọ nꞌụwa mata na nꞌihu Chineke ha bụ ndị ikpe mara.
Igbo 2006
Ma ayi matara na ka ha ra, bú ihe iwu Chineke nēkwu, ọ nāgwa ndi nọ n'okpuru iwu ahu; ka ewe kpuchita ọnu nile n'otù n'otù, ka ewe kwe na ikpé mara uwa nile n'ebe Chineke nọ:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ugbu a, anyị maara na ihe ọbụla iwu kwuru, ọ bụ ndị nọ nʼokpuru iwu ka ọ dịịrị, ka esite otu a kpuchite ọnụ niile nʼotu nʼotu. Ma meekwa ka ụwa niile mata na ha bụ ndị ikpe mara nʼebe Chineke nọ.