Romans 3:20 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi na o nweghị onye ọ bụla a pụrụ ịgụ nꞌonye ezi omume nꞌihu Chineke maka na o debere iwu. Kama ihe iwu na-eme bụ igosi anyị na anyị bụ ndị mmehie.
Igbo 2006
n'ihi na site n'ọlu nile nke iwu ọ dighi madu ọ bula agāgu n'onye ezi omume n'iru Ya: n'ihi na ọ bu n'aka iwu ka nmazu nke nmehie sitere.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na o nweghị onye ọbụla a pụrụ ịgụ nʼonye ezi omume nʼihu Chineke maka na ọ na-edebe iwu. Kama, ọ bụ site nʼiwu ka anyị ji mata ihe banyere mmehie.