Romans 3:4 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Tụfịakwa! Chineke ekwela! Ọ bụrụdị na mmadụ nile nọ nꞌụwa aghọọ ndị okwu ụgha, eziokwu nke Chineke ga-adịgide. Nꞌihi na e dere nꞌakwụwkọ nsọ sị na okwu ọ bụla Chineke kwuru ga-abụ eziokwu mgbe nile. Ka e si otu a mee ka Chineke bụrụ onye mmeri mgbe ọ bụla onye ọ bụla jụrụ ajụjụ banyere okwu ahụ.
Igbo 2006
Chineke ekwela: kama ka ọ puta ihè na Chineke bu Onye ezi-okwu, ma madu nile n'otù n'otù bu ndi-ugha; dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ka ewe gua Gi n'onye ezi omume n'okwu-Gi nile, Ka I we kpeb͕u kwa mb͕e anēkpe Gi ikpé.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ pụghị ịdị otu a! Kama ka ọ bụrụ ihe pụtara ihe na Chineke bụ onye eziokwu, ma mmadụ niile bụ ndị okwu ụgha, dịka e dere ya, “Ka e nwe ike gosipụta na ị na-ekwu eziokwu mgbe ọbụla i kwuru okwu, na ekpegbukwa mgbe i na-ekpe ikpe.”