Romans 3:7 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi na ọ bụrụ na a na-esite nꞌokwu ụgha m na-ewetara Chineke otuto, ebe ọ bụ na okwu ụgha m na-eme ka eziokwu Chineke pụtazie nke ọma, gịnị mere a ga-eji maa m ikpe mmehie?
Igbo 2006
Ma ọ buru na ezi-okwu nke Chineke babigara uba ókè n'iwetara Ya ebube site n'okwu-ugha nkem, gini mere anēkpe kwa mu onwem ikpé ọzọ dika onye-nmehie?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Otu onye nwere ike ị sị, “na ọ bụrụ na a na-esite nʼokwu ụgha m, mee ka eziokwu nke Chineke pụta ìhè karịa, na-ewetara Chineke otuto, gịnị mere e ji ama m ikpe dịka onye mmehie?”