Romans 3:8 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi na ọ bụrụ na ajọ omume m na-ewetara Chineke ezi otuto, mgbe ahụ ihe anyị ga-ekwu bụ na ọ dị mma ka anyị nọgide na-eme ihe ọjọọ ka ihe ọma si na ya bịa. (Nꞌezie, ọmụma ikpe na-eche ndị na-ekwu ụdị okwu a bụ ọmụma ikpe ziri ezi.) Ma ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ ụdị okwu a ka m na-ekwusa.
Igbo 2006
gini me-kwa-ra ayi asighi, Ka ayi me ihe ọjọ, ka ezi ihe we puta? (dika anēkwulu ayi, dika ufọdu nēkwu kwa na ayi nāsi), ndi ikpé-ha ziri ezi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ pụtara na anyị ga-asị, “ka anyị na-eme ihe ọjọọ ka ezi ihe si na ya pụta”? Ụfọdụ ndị mmadụ ji nkwutọ na-ebo m ebubo na m na-akụzi ihe dị otu a, ikpe a mara ha kwesiri ekwesi.