Romans 4:11 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Chineke ekwechaala nkwa na ya ga-agọzi Eberaham tupuu e bie ya ugwu. Obibi ugwu ya bụ nanị ihe ngosi na Chineke anabatala ya, gụọ ya nonye ezi omume nihi okwukwe ya nime Chineke. Ọ bụ nke a mere Eberaham ji bụrụ nna ndị nile kweere na Chineke, ndị ahụ ọ gụrụ dị ka ndị ezi omume, ọ bụ ezie na ha bụ ndị a na-ebighị ugwu.
Igbo 2006
ọ we nara ihe-iriba-ama nke bu obibì-úgwù, bú akàrà nke ezi omume nke okwukwe ahu nke di n'ebìghi-úgwù-ya: ka o we buru nna nke ndi nile kwere, ọ bu ezie na ha nọ n'ebìghi-úgwù, ka ewe gua ezi omume nye ha;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ natara ihe ịrịbama nke obibi ugwu dịka akara nke ezi omume nke okwukwe o nwere mgbe ọ nọ na-ebighị ugwu. Nke a bụ ime ya nna ndị niile kweerenụ, ndị ahụ ọ gụrụ dịka ndị ezi omume, ọ bụ ezie na ha bụ ndị a na-ebighị ugwu.