Romans 4:16 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ya mere Chineke na-enye anyị ngọzi ya nile site nokwukwe anyị nwere nime ya. Ọ na-enyekwa anyị ya nefu. Anyị ga-anata onyinye ndị a ma ọ bụrụ na anyị enwee ụdị okwukwe Eberaham nwere. Ya mere nihe gbasara inwe okwukwe nime Chineke, Eberaham bụ nna anyị.
Igbo 2006
N'ihi nka o sitere n'okwukwe, ka o we di ka amara si di; ka nkwa ahu we guzosie ike n'ebe nkpuru ahu nile nọ; ọ bughi nání ndi sitere n'iwu ahu, kama ọ bu kwa ndi sitere n'okwukwe Abraham, onye bu nna nke ayi nile.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, nkwa ahụ na-abịa site nʼokwukwe, ka ọ bụrụ naanị site nʼamara ka e ji mee ka ụmụ ya niile nweta ya, ọ bụghị naanị nye ndị nọ nʼokpuru iwu, kama ọ bụkwa nye ndị nwere ụdị okwukwe Ebraham. Nʼihi na ọ bụ nna anyị niile.