Romans 4:17 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nke a bụ ihe akwụkwọ nsọ na-ekwu nebe ahụ e dere ya sị, “Emeela m gị ka ị bụrụ nna ọtụtụ mba.” Ya mere, nihu Chineke ahụ Eberaham kweere nime ya, Eberaham bụ nna anyị. Ee, ọ bụ nna anyị nihu Chineke ahụ na-eme ka ndị nwụrụ anwụ dịkwa ndụ ọzọ, onye na-enye iwu mee ka ihe na-adịbeghị dịrị.
Igbo 2006
(dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Nna nke ọtutu mba ka M'meworo gi,) n'iru Onye o kwere, bú Chineke, Onye nēme ndi nwuru anwu ka ha di ndu, Onye nākpọ kwa ihe nādighi, dika asi na ha di.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Dịka e dere ya, “Emeela m gị nna nke ọtụtụ mba.” Ya mere, nʼihu Chineke ahụ bụ onye o kweenyere nʼime ya, bụ onye ahụ na-eme ka ndị nwụrụ anwụ dịkwa ndụ ọzọ, onye na-akpọkwa ihe ndị na-adịbụghị, mee ka ha dịrị.