Romans 4:18 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Eberaham kweere okwu Chineke mgbe ihe ọ bụla na-adịghị nke ọ pụrụ iji tụkwasị Chineke obi. O sitere nụzọ dị otu a bụrụ nna nke ọtụtụ mba, dị ka Chineke gwara ya na ụmụ ụmụ ya gaamụba.
Igbo 2006
Onye kwere mb͕e ọ gasiri oge olile-anya, ebe ọ dabere n'olile-anya, ka o we ghọ nna ọtutu mba, dika ihe ekwururi si di, Otú a ka nkpuru-gi gādi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụladị mgbe olileanya gasịrị, o kwenyere na ya ga-abụ nna nke ọtụtụ mba, dịka ihe a gwara ya si dị, “Otu a ka mkpụrụ gị ga-adị. ”