Romans 4:9 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Onye ka ngọzi a Devidi kwuru okwu ya dịịrị? Ọ dịịrị ndị Juu kweere na Kraịst ma na-edebekwa iwu? Ka ọ dịịrị ndị ahụ kweere na Kraịst ma ha adịghị edebekwa iwu? Ka anyị lee anya na ndụ Eberaham. Ihe anyị kwuru bụ na Chineke nabatara ya nihi okwukwe ya. Chineke ọ nabatara ya nihi okwukwe ya nanị? Ka ọ nabatara ya nihi na o debekwara iwu?
Igbo 2006
Ọ̀ bu kwa ndi obibì-úgwù ka anākpọ ndi ngọzi a diri, ma-ọbu kwa ndi ebìghi-úgwù? n'ihi na ayi nāsi, Aguru okwukwe Abraham nye ya dika ezi omume.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ngọzị a ọ dịrị naanị ndị e biri ugwu ka ọ bụ nyekwa ndị a na-ebighị ugwu? Ihe anyị na-ekwu bụ na a gụrụ okwukwe Ebraham dị ka ezi omume nye ya.