Romans 5:14 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma e mere ka ọnwụ rute onye ọ bụla site nꞌoge Adam ruo nꞌoge Mosisi. Ma ha anwụghị nꞌihi mmehie nke aka ha, ebe ọ bụ na ọ bụghị ha onwe ha nupụrụ isi nꞌiwu ahụ Chineke nyere Adam. Adam nꞌonwe ya nọkwa ọnọdụ dị ka ihe ịma atụ nke na-egosi Onye ahụ nke gaje ịbịa.
Igbo 2006
Otú ọ di, ọnwu si n'oge Adam buru eze rue oge Moses, ọbuná ichiri ndi nēmehieghi n'oyiyi nke njehie Adam, onye bu ihe-atù nke Onye ahu gaje ibia.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma e mere ka ọnwụ rute onye ọbụla site nʼoge Adam ruo nʼoge Mosis. O metụtara ọ bụladị ndị mmehie ha na-adịghị ka nke Adam, onye bụ ihe atụ nke onye ahụ gaje ịbịa.