Romans 5:15 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Leekwa ihe dị iche nꞌetiti mmehie mmadụ mere na mgbaghara mmehie Chineke! Nꞌihi na ọ bụ site na mmehie otu onye ka ọnwụ ji zuo ọha ọnụ. Ugbu a ọ bụkwa site nꞌaka otu onye, Jisọs Kraịst, ka mgbaghara mmehie ji rute mmadụ nile aka site nꞌobi ebere Chineke.
Igbo 2006
Ma dika ndahie ahu si di, ọ bughi otú a ka onyinye-amara si di kwa. N'ihi na asi na ọra madu nwuru site na ndahie nke otù onye ahu, amara Chineke, na onyinye ahu nke di nime amara nke otù Madu ahu, Jisus Kraist, babigara ókè kari ri nne rue ọra madu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma onyinye a adịghị ka njehie ya. Nʼihi na ọ bụrụ na ọtụtụ nwụrụ site na mmehie nke otu mmadụ, lee ka o siri bụrụ ihe dị ukwu karịa na amara Chineke na onyinye amara sitere nʼotu onye bụ Jisọs Kraịst ga-ababiga ụba oke rute ọtụtụ mmadụ.