Romans 5:16 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mmehie Adam buteere mmadụ nile ọmụma ikpe ọnwụ, ma Kraịst bịara wepụ ọtụtụ mmehie, site nꞌụzọ dị otu a wetara anyị onyinye Chineke, nke bụ ndụ na-ejubiga oke.
Igbo 2006
Onyinye ahu abughi kwa dika o sitere n'aka otù onye nke mehiere: n'ihi na ikpé sitere n'otù onye bia weta amam-ikpe, ma onyinye-amara ahu sitere n'ọtutu ndahie bia weta ọlu igu madu na ndi ezi omume.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọzọ, onyinye a adịghị ka ihe mmehie mmadụ mụpụtara. Nʼihi na ikpe ahụ sooro mmehie otu onye weta ọmụma ikpe, ma onyinye ahụ sooro ọtụtụ njehie weta ịgụ mmadụ nʼonye ikpe na-amaghị.