Romans 5:17 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọ bụ ezie na ọnwụ malitere ịchị ụwa nꞌihi mmehie otu nwoke, ma ndị nile ga-anabatara onwe ha onyinye mgbaghara Chineke, na onyinye nke ịbụ ndị ezi omume nke ọ na-enyekwa, ga-esite nꞌihe Kraịst meere ha bụrụ ndị nwere ndụ nke ọnwụ na-agaghị eemri.
Igbo 2006
N'ihi na asi na ọnwu si n'aka otù onye ahu buru eze, site na ndahie nke otù onye ahu; ndi nānata nbabiga-ókè nke amara ahu na nke onyinye ahu, bú ezi omume, gābu kari eze ri nne na ndu site n'aka otù Onye ahu, bú Jisus Kraist.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, ọ bụrụ na ọnwụ chịrị ọchịchị site na njehie nke otu onye, ọ bụghị ihe dị ukwu karịa na ndị nabatara onyinye amara Chineke bara ụba, ya na onyinye ezi omume, ga-achị achị na ndụ site nʼotu onye ahụ bụ Jisọs Kraịst.