Romans 5:20 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe iwu bịara, e sitere na ya mee ka mmadụ nile hụ otu mmehie si babiga ụba oke. Ma mgbe anyị na-ahụ ịba ụba nke mmehie anyị anya, mgbe ahụ ka anyị na-ahụkwa ịbabiga ụba oke nke amara Chineke na mgbaghara ya.
Igbo 2006
Iwu we b͕ebà, ka ndahie ahu we rie nne; ma n'ebe nmehie riri nne, n'ebe ahu ka amara babigara ókè nke-uku kari:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Iwu bịara mee ka mmehie na-aba ụba, ma dịka mmehie na-aba ụba, amara na-abakwa ụba karịa.