Romans 5:6 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Leenụ nụ ka obi ebere Chineke siri dị ukwuu. Mgbe ahụ anyị na-enweghị ike ọ bụla, mgbe oge ahụ ruru nnọọ, Jisọs bịara nwụọ ọnwụ nꞌihi anyị ndị mmehie.
Igbo 2006
N'ihi na mb͕e ayi nọ nādighi ike, mb͕e oge-Ya ruru Kraist nwuru n'ihi ndi nādighi-asọpuru Chineke.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ anyị na-enweghị ike ọbụla, mgbe oge ahụ ruru nnọọ, Kraịst bịara nwụọ ọnwụ nʼihi anyị bụ ndị mmehie.