Romans 6:13 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ekwekwala ka akụkụ ọ bụla nke ahụ gị bụrụ ngwa ọrụ mmehie. Kama nyefee onwe gị kpamkpam nꞌaka Chineke, akụkụ ahụ gị nile, ka ị bụrụkwa ezi ngwa ọrụ nꞌaka ya. Nꞌihi na ọ bụ nzọpụta ka a zọpụtara gị site nꞌaka ọnwụ. Ka Chineke jiri gị rụpụta nzube ọma ya nile.
Igbo 2006
unu adi-kwa-la nēche ihe di unu n'aru n'iru nmehie ka ha buru ihe-agha ajọ omume; kama chenu onwe-unu n'iru Chineke, dika ndi sitere na ndi nwuru anwu di ndu, che-kwa-nu ihe di unu n'aru n'iru Chineke ka ha buru ihe-agha ezi omume.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Unu a nakwala eche akụkụ ahụ unu ọbụla ka ọ bụrụ ngwa ọrụ ajọ omume. Kama cheenụ onwe unu nʼihu Chineke, dịka ndị esi nʼọnwụ kpọpụta nyefee na ndụ. Cheenụ akụkụ ahụ unu niile nʼihu Chineke dịka ngwa ọrụ nke ezi omume.