Romans 6:16 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ bụ na unu amataghị na onye ọ bụla unu na-ejere ozi, na onye unu na-erubekwara isi bụ Onyenwe unu? Unu ka ọ dịrị ịhọrọ ịbụ ohu mmehie nke na-eduba nꞌọnwụ, ma ọ bụkwanụ irubere Chineke isi onye na-enye ndụ ebighị ebi.
Igbo 2006
Ùnu amataghi na onye unu nēche onwe-unu n'iru ya ka unu buru ndi-orù iṅa ya nti, unu bu ndi-orù nke onye ahu unu nāṅa nti ya; ma-ọbu nke nmehie nēweta ọnwu, ma-ọ̀bu nke iṅa-nti nēweta ezi omume?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụ na unu amataghị na mgbe unu weere onwe unu nye mmadụ irubere ya isi dịka ohu, unu bụ ohu nye onye ahụ unu na-erubere isi, maọbụ ohu nye mmehie nke na-eduba nʼọnwụ, ma ọ bụkwanụ irube isi nke na-eduba nʼezi omume?