Romans 6:19 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Eji m odibo na nna ya ukwu na-amara unu atụ nꞌihi na ọ ga-eme ka unu ghọta ihe m na-ekwu. Ya mere, dị ka unu si rubere mmehie isi, rụọ ọrụ ọjọọ nile ọ chọrọ na mbụ, sitekwanụ otu a jeere Chineke ozi, ịrụpụta ihe nile dị mma, na ihe dị nsọ na ndụ unu.
Igbo 2006
Anamekwu dika madu n'ihi adighi-ike nke anu-aru-unu: n'ihi na dika unu chere ihe nile di unu n'aru n'iru adighi-ọcha na n'iru imebi-iwu nēdubà n'imebi-iwu ka unu buru ndi-orù-ha, otú a chenu ihe nile di unu n'aru n'iru ezi omume ub͕u a, bú nke nēdubà n'ido-nsọ, ka unu buru ndi-orù-ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ana m eji ihe ịmaatụ site na ndụ a na-ebi kwa ụbọchị, nʼihi adịghị ike nke anụ ahụ mmadụ. Ya mere, dịka unu si were ahụ unu dị iche iche nye ịbụ ohu adịghị ọcha na ajọ omume nke na-abawanye ụba, sitekwanụ otu a were ha nye ugbu a ka ha bụrụ ohu ezi omume nke na-eduba nʼịdị nsọ.