Romans 7:13 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Olee otu iwu siri bụrụ ihe dị mma? Ọ̀ bụghị iwu wetara ikpe ọmụma? Ò si aṅaa bụrụkwanụ ihe dị mma? Ka m kọwaa. Ọ̀ bụghị iwu bụ ihe dị njọ, kama ọ bụ mmehie bụ ihe jọgburu onwe ya na njọ. Nꞌihi na ọ bụ mmehie weere iwu dị mma, mee ka e site na ya wetara m ikpe ọmụma. Ị hụla ka mmehie si bụrụ nnọọ ihe arụrụ ala na ihe aghụghọ na ihe na-eweta ọnwụ? O ji iwu ọma Chineke mere ngwa ọrụ ihe ọjọọ ya.
Igbo 2006
Ya mere, èzi ihe ahu ghọrọ ọnwu n'ebe m'nọ? Chineke ekwela. kama ọ bu nmehie, ka o we puta ìhè na ọ bu nmehie, site n'iwere ezi ihe ahu lutaram ọnwu; ka nmehie we site n'ihe ahu enyere n'iwu ghọ ihe nēmehie nke-uku ri nne.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, ọ pụtara na ihe ahụ dị mma wetaara m ọnwụ? Mba! Kama ọ bụ mmehie sitere nʼihe dị mma wetara m ọnwụ, ka e nwee ike gosipụta na mmehie bụ ihe jọgburu onwe ya site nʼihe e nyere nʼiwu.