Romans 7:14 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ka anyị site nꞌụzọ ọzọ lee ya anya, ịwu bụ ihe dị mma, ma ebe nsogbu a nile si bụ nꞌaka m. Adịghị m nsọ nꞌihi na abụ m onye e refuru erefu, dị ka ohu, nye nꞌaka mmehie. Ọ bụkwa mmehie na-achị ndụ m.
Igbo 2006
N'ihi na ayi matara na iwu ahu bu ihe nke Mọ: ma mu onwem bu ihe nke anu-aru, erewokwam inọ n'okpuru nmehie.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Anyị matara na iwu bụ ihe nke mmụọ ebe mụ onwe m bụ anụ ahụ efu, onye e rere dịka ohu nye mmehie.