Romans 7:15 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
O nweghị ụzọ ụdị ndụ m na-ebi si doo m anya. Nꞌihi na mgbe ọ bụla m chọrọ ime ihe dị mma, ọ naghị ekwe m, kama ihe ahụ m kpọrọ asị bụ ihe na-agara m aka ime mgbe nile.
Igbo 2006
N'ihi na ihe m'nāluta ka m'nāmagh: n'ihi na ihe m'nāchọ, ọ bughi ihe ahu ka m'nēme; kama ihe m'nākpọ asì, ihe ahu ka m'nēme.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
O nweghị ụzọ ihe m na-eme si doo m anya. Nʼihi na ihe m na-eme abụghị ihe m chọrọ ime, ọ bụ ihe m kpọrọ asị bụ ihe na-agara m aka ime mgbe niile.