Romans 7:18 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
O doro m anya na ọ bụ nanị ihe ọjọọ jupụtara nꞌime m. Enweghị m ike mee otu ihe dị mma. Ọtụtụ mgbe ọ na-agụ m ka m mee ihe dị mma ma anaghị m eme ya.
Igbo 2006
N'ihi na amataram na ezi ihe adighi-ebi nimem, nke ahu bu, n'anu-arum: n'ihi na ichọ ihe ọma di nso n'ebe akam gēru, ma iluta ihe ọma adighi nso n'ebe akam gēru.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
O doro m anya na o nweghị ihe ọma ọbụla dị nʼime m, ya bụ nʼime anụ ahụ m. Nʼihi na ọ na-agụ m agụụ ime ezi ihe, ma ike ime ezi ihe adịghị nʼime m.