Romans 7:23 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma ana m ahụ na ọ dị akụkụ ahụ m nke na-alụso echiche obi m ọgụ, na-emerikwa ya, si otu a mee m ka m bụrụ ohu mmehie. Nꞌime obi m ọ na-agụ m agụụ ịbụ ezi ohu Chineke, ma ihe m chọpụtara bụ na abụ m mmadụ mmehie na-achị. Leenụ ka o si dị: ndụ ọhụrụ dị nꞌime m na-achọ ime ihe ziri ezi, ma ndụ ochie ahụ bi nꞌime m hụrụ mmehie nꞌanya.
Igbo 2006
ma anamahu iwu di iche n'ihe nile dim n'aru, nēbu agha megide iwu nke uchem, nādọtakwam n'agha nye iwu nke nmehie nke di n'ihe nile dim n'aru.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ana m ahụta iwu ọzọ dị nʼime m nke na-agba mgba megide iwu nke dị nʼuche m, ime ka m bụrụ ohu nye iwu nke mmehie na-arụ ọrụ ya nʼanụ ahụ m.