Romans 7:25 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma ekele dịrị Chineke site na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị! Ana m eji mmụọ m nile na-ejere iwu Chineke ozi, ma nꞌanụ ahụ m, abụ m ohu mmehie.
Igbo 2006
Ma ekele diri Chineke na ndọputa sitere n'aka Jisus Kraist Onye-nwe-ayi. Ya mere otú a mu onwem ji uchem buru orù nke iwu Chineke; ma ejim anu-arum buru orù nke iwu nmehie.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ekele dịrị Chineke, onye na-anapụta m site na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị! Ya mere, nʼime mmụọ m, abụ m odibo nye iwu Chineke, ma nʼime anụ ahụ mmehie m, abụ m ohu nye iwu nke mmehie.