Romans 7:4 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌụzọ dị otu a, unu onwe unu dị ka nwanyị lụrụ di. Na mbụ, di unu bụ iwu ndị Juu. Ma mgbe Kraịst nwụru, unu soro ya nwụọ. Nꞌihi nke a, ebe a gụrụ unu na ndị nwụrụ anwụ, ihe ọ bụla ejikọtakwaghị unu na iwu ndị Juu. O nwekwaghị ike ọ bụla nꞌebe unu nọ. Mgbe Kraịst biliri nꞌọnwụ, unu sokwara ya bilie bụrụ ndị dị ọhụrụ. Ugbu a, onye na-alụ unu bụ onye ahụ si nꞌọnwụ bilie. Ọ na-alụ unu ime ka unu nwee ike ịmị ezi mkpụrụ, nke bụ ezi omume nye Chineke.
Igbo 2006
Ya mere, umu-nnam, esite-kwa-ra n'aru Kraist me ka unu onwe-unu nwua n'ebe iwu di; ka unu we lakuru di di iche, bú Onye emere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, ka ayi we miara Chineke nkpuru.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, ụmụnna m, unu onwe unu kwa anwụọla nʼebe iwu dị site nʼahụ Kraịst, ka e nwe ike kenye unu onye ọzọ, bụ onye ahụ e mere ka o si nʼọnwụ bilie. Ka anyị site na ya mịa mkpụrụ nye Chineke.