Romans 7:5 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe anụ ahụ mmehie na-achị unu, ọchịchọ ọjọọ jupụtara nꞌime unu, na-eme ka ọ na-agụ unu agụụ ime nanị ajọ omume nke iwu Chineke megidere.
Igbo 2006
N'ihi na mb͕e ayi nọ n'anu-aru, ọchichọ ọjọ nile nke diri nmehie nile ayi, nke sitere n'aka iwu ahu, nālusi ọlu ike n'ihe nile di ayi n'aru imiri ọnwu nkpuru.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe anụ ahụ mmehie na-achị anyị, ọchịchọ ọjọọ nke iwu na-akpali jupụtara nʼime anyị, nke mere na anyị na-amị mkpụrụ nye ọnwụ.