Romans 7:6 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma ugbu a, ebe anyị bụ ndị nwụrụ anwụ nꞌebe iwu kere anyị agbụ dị, a napụtakwala anyị site nꞌaka ya, ime ka anyị bụrụ ndị sitere nꞌụzọ ọhụrụ nke Mmụọ na-ejere Chineke ozi. Ọ bụkwaghị nꞌụzọ ochie nke iwu e dere ede si chọọ.
Igbo 2006
Ma ub͕u a atọpuwo ayi n'iwu ahu, ebe ayi nwuru n'ebe ihe ahu di nke ejidesiri ayi ike nime ya; ya mere ayi nābu orù n'idi-ọhu nke Mọ Nsọ, ọ bughi kwa n'idi-ochie nke ihe edeworo n'akwukwọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ugbu a, a tọghapụla anyị pụọ nʼaka iwu ebe anyị nwụrụ nye ihe ndị kere anyị agbụ na mbụ, anyị anaghị ebikwa ndụ nʼusoro iwu ochie nke e dere nʼakwụkwọ, kama anyị na-eje ozi nʼusoro ndụ ọhụrụ nke mmụọ.