Romans 8:17 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ugbu a, ọ bụrụkwa na anyị bụ ụmụ ya, anyị gaeketa oke nꞌakụ ahụ dị nꞌalaeze Chineke. Nꞌihi na ihe nile Chineke nyere Jisọs abụrụla nke anyị. Ọ bụrụkwa nꞌezie na anyị ga-eso Kraịst keta oke nꞌotuto ya, anyị aghaghị iso ya keta oke na ntaramahụhụ ya.
Igbo 2006
ma ọ buru na ayi bu umu, ayi bu kwa ndi-nketa; ndi-nketa nke Chineke, na ndi ha na Kraist nēkekọ; ma ọ buru na ọ bu ezie na ayi na Ya nāhukọ ahuhu, ka ewe nyekọ kwa ayi na Ya otuto.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ugbu a, ọ bụrụ na anyị bụ ụmụ, ọ pụtara na anyị bụ ndị nketa oke, ndị ga-eketa ihe Chineke nwere, na ndị ha na Kraịst ga-ekekọta ihe, ma ọ bụrụ nʼezie na anyị ga-esoro ya keta oke ahụhụ ya, ka anyị si otu a sorokwa ya keta oke nʼebube ya.