Romans 8:2 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌihi na ike ahụ Mmụọ na-enye ndụ na-enye abụrụla nke m, site nꞌịdị nꞌotu nke mụ na Kraịst. Ike a emekwaala ka m nwere onwe m nꞌebe ike nile nke mmehie na ọnwụ dị.
Igbo 2006
N'ihi na iwu nke Mọ nke ndu nime Kraist Jisus mere ka m'pua n'aka iwu nke nmehie na nke ọnwu, nwere onwem.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na site na Kraịst Jisọs iwu nke Mmụọ na-enye ndụ emeela ka m nwere onwe m site nʼiwu nke mmehie na ọnwụ.