Romans 8:23 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọ bụghị nanị nke a, ma anyị onwe anyị bụ ndị Kraịst, ndị nwere Mmụọ Chineke, nọkwa na-asụ ude nꞌime obi anyị, na-eche ọbịbịa nke ụbọchị ahụ, mgbe a ga-ewezugara anyị ihe mgbu na ọrịa nile. Anyị nọkwa na-ele anya ọbịbịa nke ụbọchị ahụ mgbe Chineke ga-enye anyị ihe nile kwesịrị anyị dị ka ụmụ Chineke, ya na ahụ ọhụrụ ahụ o kwere anyị na nkwa, ahụ nke na-agaghị arịakwa ọrịa ọzọ, nke na-agaghị anwụkwa ọzọ.
Igbo 2006
Ma ọ bughi nání nka, kama ayi onwe-ayi, ndi nwere nkpuru mbu nke Mọ Nsọ, ọbuná ayi onwe-ayi nāsu kwa udè nime onwe-ayi, mb͕e ayi nēchesi ido-ka-nwa-nwoke ahu ike, bú nb͕aputa nke aru-ayi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụghị naanị nke a, ma anyị onwe anyị, ndị nwere mkpụrụ mbụ nke Mmụọ Nsọ, na-asụkwa ude nʼime onwe anyị, na-echesi ike mgbe a ga-akpọbata anyị dịka ụmụ, mgbe a ga-agbapụta anụ ahụ anyị.