Romans 8:26 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ọ bụla kwa anyị ji ndidi na-eche ihe anyị nwere olileanya na anyị ga-enweta, Mmụọ Nsọ na-enyere anyị aka nꞌọnọdụ adịghị ike anyị nile. Nꞌihi na nꞌọnọdụ ụfọdụ, anyị adịghị ama ihe anyị kwesịrị ịrịọ Chineke ka o meere anyị, ma ọ bụ otu anyị ga-esi doo ọnụ anyị kpee ekpere ahụ, ma Mmụọ Nsọ na-eji ịsụ ude nke mmadụ na-enweghị ike ịkọwa na-arịọrọ anyị arịrịọ.
Igbo 2006
Otù ahu Mọ Nsọ nēye-kwa-ra adighi-ike-ayi aka: n'ihi na ayi amataghi ihe ayi gēkpe n'ekpere dika ayi nāghaghi ikpe; kama ọ bu Mọ Nsọ onwe-ya were isu-udè anāpughi ikwu nāriọrọ ayi aririọ;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Otu aka ahụ, Mmụọ Nsọ na-enyere anyị aka nʼime adịghị ike anyị. Nʼihi na anyị amaghị ka esi ekpe ekpere dịka o kwesiri. Ma Mmụọ Nsọ nʼonwe ya ji ịsụ ude nke ọnụ apụghị ịkọ na-arịọrọ anyị arịrịọ.