Romans 8:3 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
A zọpụtaghị anyị nꞌihi na anyị debere iwu, nꞌihi na ọ dịghị mgbe anyị na-edebe ya, anyị enwekwaghị ike idebe ya. Ma Chineke sitere nꞌụzọ dị iche zọpụta anyị. Chineke zitere Ọkpara ya ka ọ bịa nꞌụdị anyị bụ mmadụ ka ọ laa ike nke mmehie nꞌiyi, site nꞌiji onwe ya chụọ aja nꞌihi mmehie anyị.
Igbo 2006
N'ihi na ihe iwu ahu nāpughi ime, nke ọ nādighi ike nime ya site n'anu-aru, Chineke mere, n'ihi na Ọ mara nmehie ikpé n'anu-aru, mb͕e O zitere Ọkpara nke aka Ya n'oyiyi nke anu-aru nmehie na dika àjà achuru n'ihi nmehie:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na ihe iwu na-enweghị ike ime, nʼihi adịghị ike nke anụ ahụ, ka Chineke mere, site nʼizite Ọkpara ya, ka ọ bịa nʼụdịdị anụ ahụ mmehie, bụrụ aja mmehie, site otu a, maa mmehie ikpe na anụ ahụ.