Romans 8:30 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ bụkwa ndị ahụ nile Chineke họpụtara, ka ọ kpọrọ ka ha bịakwute ya. Mgbe ha bịara, Chineke mere ka ha bụrụ ndị ya na ha dị na mma. Ọ gụrụ ha dị ka ndị na-emeghị mmehie ọ bụla, meekwa ka ha bụrụ ndị gaeketa oke nꞌebube ahụ o kwere na nkwa.
Igbo 2006
ma ndi O buru uzọ ka àkà, ndia ka Ọ kpọ-kwa-ra: ma ndi Ọ kpọrọ, ndia ka Ọ gu-kwa-ra na ndi ezi omume: ma ndi Ọ guru na ndi ezi omume, ndia ka O nye-kwa-ra otuto.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ndị ahụ ọ kara akara, ka ọ kpọkwara; ndị ọ kpọrọ, ka ọ gụrụ na ndị ezi omume; ndị ọ gụrụ na ndị ezi omume ka o nyekwara otuto.