Romans 8:33 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ònye pụrụ ịpụta nꞌihu Chineke boo anyị bụ ndị ya ọ họpụtara ebubo mmehie? Ònye ka ọ bụ? Chineke nꞌonwe ya ọ ga-ebo anyị ebubo nꞌihi mmehie anyị? Mba! Nꞌihi na ọ bụ ya onwe ya gbaghaara anyị mmehie anyị, mee ka anyị na ya dị na mma.
Igbo 2006
Ònye gēbo ndi Chineke rọputara ebubo? Ọ̀ bu Chineke Onye nāgu ha na ndi ezi omume?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Onye pụrụ ibo ndị ahụ Chineke họpụtara ebubo? Ọ bụ Chineke na-agụ mmadụ dịka onye ezi omume.