Romans 8:34 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ahụ, olee onye ọzọ nwere ike ịma anyị ikpe ọnwụ? Ọ̀ bụ Kraịst? Mba! Nꞌihi na Kraịst bụ onye ahụ nwụrụ nꞌihi anyị, ọ bụkwa onye ahụ e mere ka o si nꞌọnwụ bilie, mee ka ọ nọọ nꞌaka nri Chineke, ebe ọ nọ na-arịọrọ anyị arịrịọ.
Igbo 2006
Ònye bu onye ahu nke gāma ikpé? Ọ̀ bu Kraist Jisus Onye nwuru, ma nke kariri, emere Ya ka O si na ndi nwuru anwu bilie, Onye nọ n'aka-nri Chineke, Onye nāriọ-kwa-ra ayi aririọ?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Onye bụ onye ahụ nke ga-ama ikpe? Ọ bụ Kraịst Jisọs onye nwụrụ, ma karịa nke ahụ, onye e mere ka o si nʼọnwụ bilie, nọ nʼaka nri Chineke na-arịọtakwara anyị arịrịọ.