Romans 8:35 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ̀ dị onye nwere ike ikewapụ anyị site nꞌịhụnanya Kraịst nwere nꞌebe anyị nọ? Ọ bụrụ na anyị anọọ nꞌọnọdụ nsogbu, ma ọ bụ na mkpagbu, ma ọ bụ nꞌahụhụ, ihe ndị a ha na-egosi na Kraịst ahụkwaghị anyị nꞌanya? Mba! A sịkwa na anyị anọọ nꞌọnọdụ agụụ, ma ọ bụ nꞌụkpa, ma ọ bụ nꞌọnọdụ ihe egwu, ma ọ bụkwanụ nꞌọnwụ, ọ na-egosi na Chineke agbaketala anyị azụ? Mba!
Igbo 2006
Ònye gēkewapu ayi n'ihu-n'anya nke Kraist? Ọ̀ bu nkpab͕u, ma-ọbu oké nkpà, ma-ọbu nsob͕u, ma-ọbu oké unwu, ma-ọbu ib͕a-ọtọ, ma-ọbu ize-ndu, ma-ọbu mma-agha?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Onye nwere ike ikewapụ anyị site nʼịhụnanya Kraịst? Ọ bụ nsogbu, ka ọ bụ ihe isi ike, ka ọ bụ mkpagbu. Ka ọ bụ ụnwụ, ka ọ bụ ịgba ọtọ, ka ọ bụ ihe egwu, ka ọ bụ mma agha?