Romans 8:9 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma lee! Ọ bụrụ na Mmụọ Chineke bi nꞌime unu na-achị ndụ ọhụrụ unu, unu agaghị emekwa uche ọdịdị ochie unu. Chetakwa na ọ bụrụ na Mmụọ Kraịst ebighị nꞌime gị, ị bụghị onye nke Kraịst.
Igbo 2006
Ma unu onwe-unu anọghi n'anu-aru, kama unu nọ nime Mọ Nsọ, ma ọ buru na ọbu ezie na Mọ nke Chineke nēbi nime unu. Ma ọ buru na onye ọ bula enweghi Mọ nke Kraist, onye ahu abughi nke Ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma lee! Unu onwe unu anaghị ebizi ndụ nʼusoro nke anụ ahụ, kama unu na-ebi nʼusoro nke Mmụọ Nsọ nʼihi na Mmụọ nke Chineke bi nʼime unu. Onye ọbụla na-enweghị Mmụọ nke Kraịst abụghị nke ya.