Romans 9:11 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌakwụwkọ nsọ, Chineke kwuru sị, “Ekpebiela m igọzi nanị Jekọb, ọ bụghị Ịsọ.” Chineke kwuru okwu tupuu a mụọ ụmụ ahụ. O kwuru okwu a tupuu ha etoo, mee ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ ọ bụla. Nke a gosiri na Chineke mere ihe o kpebiri na ọ ga-eme site na mmalite. Mkpebi Chineke adabereghị nꞌihe ụmụaka ahụ mere, kama ọ dabeere nꞌihe Chineke chọrọ.
Igbo 2006
n'ihi na mb͕e akāmughi umu ahu, mb͕e ha akēmeghi kwa ihe ọ bula, ma ọ bu ezi ihe ma-ọbu ihe nādighi nma, ka ihe Chineke zubere dika nrọputa si di we digide, o siteghi n'ọlu, kama o sitere n'Onye nākpọ,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma tupu a mụọ ụmụ ejima ndị a, ma ọ bụkwanụ tupu ha emee ihe ọbụla dị mma maọbụ nke dị njọ, iji mee ka ọchịchọ Chineke banyere nhọpụta ha guzoro,